Home
Abu 1- Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike
Holy, Holy, Holy, Lord God Almighty.
Verse 1
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike,
N’isi ututu ayi gabu abu nye Gi;
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Onye-ebere,
Atọ nim’Otu, Chuku di ngọzi.
Verse 2
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Ndi nsọ neto Gi,
Natuda okpu-ha n’iru oche-eze-Gi;
Cherubim na Serafim nada n’iru Gi,
Onye nọri, nanọ, ganọgide.
Verse 3
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Gi di ebube,
Anya ndi-nmehie apugh ihu otuto-Gi;
Ọ bu nani I di nsọ: ọ digh ony’ọzọ
Zur’oke n’ike, na ihu-n’anya.
Verse 4
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Chuku-Okike,
Ọlu-Gi dum n’igwé n’uwa geto aha-Gi.
Nsọ, Nsọ, Nsọ! Onye-ebere,
Atọ nim’Otu, Chuku di ngọzi. Amen.
Welcome to your new site! You can edit this page by clicking on the Edit link. For more information about customizing your site check out http://learn.wordpress.com/



